MISSA IFUNANYA by JUDE NNAM — Lyrics

JUDE NNAM Igbo Gloria Mass Settings Staff & Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Otito dịrị Chineke n'elu kach'elu, n'ụwa udo dịịrị ndị mmadụ, ndị nwere obiọma. VERSE 1 Anyị ajaa Gị nma, anyị agọzie Gị. Anyị esekpuoro Gị, anyị etoo Gị. Anyị ekelee Gị n'ihi nnukwu ebube Gị. VERSE 2 Oseb'luwa, Chukwu, Eze nke eligwe. Chukwu Nna, Onye j'ike nile. Dinwenu Jesu Kristi, S'otu Nwa Chineke mụrụ. VERSE 3 Dinwenu Chukwu. Nwatụrụ nke Chineke, Nwa nke Nna. Gị Onye n'ekpochapụ njọ nk'ụwa, meere anyị ebere. VERSE 4 Gị Onye n'ekpochapụ njọ nk'ụwa, nara arịrịọ anyị. Gị Onye nọ n'aka nri Nna, meere anyị ebere. N'ihi na so Gị dị Nsọ, so Gị bụ Dinwenu. VERSE 5 So Gị, Jesu Kristi, Kacha dị elu, Gị na Mụọ Nsọ, N'ebube Chineke Nna. AMEN Amen, Amen, Amen. Amen, Amen, Amen.

Download the sheet music

MISSA IFUNANYA

MISSA IFUNANYA

By JUDE NNAM
Staff & Solfa
Igbo
7 pages
4 Downloads
Gloria Mass Settings
0 0

More lyrics you may want