Full Lyrics
Otito diri Chineke n'elu, n'elu kach'elu.
N'uwa, udo diiri ndi mmadu ndi nwere obi oma.
Anyi ajaa Gi mma. Anyi agozie Gi.
Anyi esekpuoro Gi. Anyi etoo Gi.
Anyi ekelee Gi n'ihi nnukwu ebube Gi,
Osebuluwa Chukwu, Eze nke eluigwe,
Chukwu Nna ji ike nile.
Dinwenu Jesu Kristi, So otu Nwa Chineke muru,
Dinwenu Chukwu, Nwa aturu nke Chineke, Nwa nke Nna.
Gi Onye naekpochapu njo nk'uwa, meere anyi ebere, ebere.
Gi Onye naekpochapu njo nk'uwa, nara aririo anyi.
Gi Onye no n'aka nri Nna, meere anyi ebere.
N'ihi na so Gi di Nso.
So Gi bu Dinwenu,
So Gi, Jesu Kristi,
kachasi di elu,
Gi na Mmuo Nso:
N'ebube Chukwu Nna.
Amen.