MISSA IFECHUKWU EKWEREM N'OTU CHINEKE (The New Igbo Translation) by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Creed (I believe) Mass Settings Staff & Solfa notation

Full Lyrics

PRIEST Ekwerem n'otu Chineke. SOPRANO Nna, Nna ji ike nile, Onye mer'elu igwe n'ala na ihe nile an'ahu anya, na ndi ana ghi ahu anya. Ya n'otu Onyenw'anyi Jesu Kristi, Nna muru tup'uwatuwa nile. Ezi Chukwu si n'Ezi Chukwu, amur'amu, emegh'eme. Ya na Nna bu otu ihe n'odidi ebigh'ebi Ha jiri buru Chukwu, Ony'esi na Ya mee ihe dum. Onye mak'ihi anyi bu mmadu na maka nzoput'anyi, siri n'elu igwe gbadata. O WER'AHU NA VEJIN MARIA, SITE NA MMUO NSO O BURU MMADU. Akpogbuo Ya n'obe n'ihi anyi, N'oge ochichi Pontus Pailet. O taa'huhu onwu, elie Ya. Ma O bilitere n'ubochi nke ato, ka Akwukwo Nso si kwuo, O rogoro n'elu igwe, noro n'aka nri Nna, ma O g'abiaghachi ozo n'ebube Ya, ikpe ndi di ndu na ndi nwur'anwu ikpe, Onye ochichi Ya n'enweghi njedebe. Ekwerem na Mmuo Nso, Dinwenu na Onye n'enye ndu, Onye si na Nna na Nwa puta, Onye an'esekpuru, n'etokodo Ya na Nna na Nwa eh! Onye si na ndi amuma kwu okwu. Ekwerem na Nzukọ nke di otu, di Nso, buru Catholic, burukw'Apostolic. Ekwuputa m otu mmiri Chukwu maka mgbaghara njo. A na m atu anya mbilite n'onwu ndi nwur'anwu na ndu uwa g'abianu. Amen.

Download the sheet music

MISSA IFECHUKWU EKWEREM N'OTU CHINEKE (The New Igbo Translation)

MISSA IFECHUKWU EKWEREM N'OTU CHINEKE (The New Igbo Translation)

By Jude Nnam
Staff & Solfa
Igbo
13 pages
8 Downloads
Creed (I believe) Mass Settings
0 0

More lyrics you may want