Misa Nke Ohuru — Lyrics

Igbo Penitential Rite / Kyrie Gloria Creed (I believe) Staff & Solfa notation

Full Lyrics

[CREED] Ekwere m n'otu Chineke, Nna ji ike niile, Onye mere eluigwe na ala, Na ihe niile a pụrụ ịhụ anya Na ndị a pụghị ịhụ anya. Ya na n'otu Onyenweanyị, Jesu Kristi, sọ otu Nwa Chineke mụrụ, Nna mụrụ tupu ụwatụụwa niile. Chukwu si na Chukwu, ìhè si n'ìhè, Ezi Chukwu si n'Ezi Chukwu, a mụrụ amụ, e meghị eme, Ya na Nna bụ otu ihe, N'ọdịdị ebighịebi ha jiri bụrụ Chukwu: Onye e si na Ya mee ihe dum. Onye maka ihi anyị bụ mmadụ na maka ihi nzọpụta anyị, siri n'eluigwe gbadata. O were ahụ na Vejin Marịa, site na Mmụọ Nsọ, Ọ bụrụ mmadụ. A kpọgbuo Ya n'obe n'ihi anyị N'oge ọchịchị Pọntus Paịlet; Ọ taa ahụhụ, nwụọ, e lie Ya. Ma O bilitere n'ụbọchị nke atọ, ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, Ọ rọgoro n'eluigwe, nọrọ n'akanri Nna. Ma Ọ gaabịaghachi ọzọ n'ebube Ya, ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe, Onye ọchịchị Ya naenweghị njedebe. Ekwere m na Mmụọ Nsọ, Dinwenụ na Onye naenye ndụ: Onye si na Nna na Nwa pụta. Onye a naesekpuru Naetokọdo Ya na Nna na Nwa: Onye si na ndị amụma kwuo okwu. Ekwere m na Nzukọ nke dị otu, dị nsọ, bụrụ katọlik, na apọstọlik. Ekwupụta m otu mmirichukwu maka mgbaghara njọ ga. Ana m atụ anya mbilitenọnwụ ndị nwụrụ anwụ, na ndụ ụwa gaabịanụ. Amen. [KYRIE] Onyenweanyị, mee ebere. Onyenweanyị, mee ebere. Kristi, mee ebere. Kristi, mee ebere. Onyenweanyị, mee ebere. Onyenweanyị, mee ebere. [GLORIA] Otito dịịrị Chineke n'elu kacha elu; N'ụwa, udo dịịrị ndị mmadụ ndị nwere obi ọma. Anyị ajaa Gị mma, anyị agọzie Gị, anyị esekpuoro Gị, anyị etoo Gị, anyị ekelee Gị n'ihi nnukwu ebube Gị Oseburụwa Chukwu, Eze nke eluigwe, Chukwu Nna ji ike niile. Dinwenụ, Jesu Kristi, sọ otu Nwa Chineke mụrụ, Dinwenụ Chukwu, Nwaatụrụ nke Chineke, Nwa nke Nna, Gị Onye naekpochapụ njọ nke ụwa, meere anyị ebere; Gị Onye naekpochapụ njọ nke ụwa, nara arịrịọ anyị. Gị Onye nọ n'aka nri Nna, meere anyị ebere. N'ihi na sọ Gị dị Nsọ, sọ Gị bụ Dinwenụ, sọ Gị, Jesu Kristi, kachasị dị elu, Gị na Mmụọ Nsọ: N'ebube Chukwu Nna. Amen.

Download the sheet music

Misa Nke Ohuru

Misa Nke Ohuru

Staff & Solfa
Igbo
4 pages
1 Downloads
Penitential Rite / Kyrie Gloria Creed (I believe)
0 0

More lyrics you may want