Full Lyrics
VERSE 1
Anụrụm akụkọ n'ihunanya N'ezie, nke nkasi obi e, na nzọpụta;
Bayere onye nke si n'igwe bịa N'ezie, O si n'elu bịa, bụ Mesaia'yị.
VERSE 2
Welite onwe gị Nkpụr'obi nkem, N'ezie, tufu ihere, e, n'obi abụa;
Jebe k'ịhụ onye nke si n'igwe bịa, N'ezie, O si n'elu bịa, bụ Mesaia'yị.
VERSE 3
Ọ dịgh onye nke Ọ ga achụpụ, N'ezie, m'ọbụ onye isi, e, m'onye ngwọrọ;
Ọ bụ n'onye mmehie nke ka si njọ Jisus ga azọpụta, e, Mesaia'yị.
VERSE 4
Ọ b'ezie, arụ nkem adịgh ike, Nmehie jurum arụ, e, m'bọrụ iwe;
Ka m'were nwuta na njọ nkem nile Jekwuru kw'onye nwem, e, Mesaia'yị.
REFRAIN
Ka m'je ka m'metụ Y'aka:
Bitụ Ya nanị aka.
Ọbụna m'metụ Y'aka,
Bitụ Ya nan' aka,
Ọ ga azọpụtakwam.