Full Lyrics
[SOLO]
Ọ bụ n'elekere atọ nke ehihie,
Ọ bụ mgbe amụma ahụ bịara na mmezu.
Ọ bụ n'elekere atọ nke ehihie,
Jesu tiri mkpu n'okolu, wee sị:
Chineke m'oo, Chineke m'oo,
Gịnị mere i ji gbaghapụ m'o Chineke m'oo?
Chi m'o, Chi m'o, Chineke m'oo,
Gịnị mere i ji gbaghapụ m'o?
[LARGO]
Lokene, lokene ụmụnne m, lokene.
Kene ka ndị agha siri weru be mapụo ya kuku ya.
Ewuu! Lokene ụmụnne m, lokene.
Lokene k'ọbara na mmiri siri gbapụta banụ.
Ewuu! Lokene ụmụnne m, lokene.
Ọbara o jiri sacha anyị na njọ ekerụwa,
Njọ mụ na gị, lokene ka ha siri mee ya kaja n'elu obe.
Ụmụnne m lokene o, ụmụnne m lokene.
Ha mara ya ube kee,
Ha kpuru ya okpu ogwu n'isi.
Kpọdọ ya n'obe, kpọdọ ya n'obe.
Jesu etie:
Chukwu o Chukwu doo zanu m'oo,
Ezi Chukwu, ezi Chukwu doo zanu m'oo.
Gịnị mere i ji gbaghapụ m'o Chineke m'oo?
[ALLEGRO]
K'anyị jee nụ je nụ n'ukwu obe,
Ngwa k'anyị jee nụ k'anyị je be n'ukwu obe.
Kunite nụ k'anyị je be nụ n'ukwu obe.
Bịa nụ k'anyị je be n'ukwu obe, k'anyị je be n'ukwu obe.
Akpọgburu ya n'obe mak'anyị, bịa k'anyị je be n'ukwu obe.
Kristi Onye nzọpụta n'akpọ gị, bịa kunite nụ k'anyị je be nụ n'ukwu obe.
Ọ bụ ebe ndụ si abịa.
Were kpere na ume ala yọba Chukwu,
Kpebe kpere mebe opipia maka njọ gị.
Bịa k'anyị je be n'ukwu obe, k'anyị je be n'ukwu obe.
Bịa o bịa.
Chukwu o Chukwu doo za n'anyị nna,
Ezi Chukwu, ezi Chukwu doo za n'anyị oo.
[ANDANTE]
Mpa anyị bịara ịnara amara.
Cheta mmadụ chetakwa,
Na ntụ, na ntụ, na ntụ aah,
Ka ị bụ ma emesia, na ntụ k'ị gaalakwa.
[BASS SOLO]
Ọbịa k'anyị bịara n'ụwa,
N'ukwu obe ebe nzọpụta anyị si abịa.
Mmadụ cheta,
Chegharịa, chegharịa, chegharịa o.