Leenu Nwaturu Chukwu by Fr Stanley Orazulike — Lyrics

Fr Stanley Orazulike Igbo Communion Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Leenu Nwa atụrụ Chukwu Achịcha ndị ọma nke si n'igwe gbadata n'ụwa Ọ bụ nri ọma Kristi nyer' anyị na Eucharistia dị asọ Sị anyị rie k'anyị wee nwee ndụ ebeebe K'anyị jeenu nara ya n'ihi na ọ bụ nri ọma Anyị nwere isi ọma bụ ndị n'eri ya VERSE 1 Etosighịm k'ị bata, O Dinwenu n'im'obi mo Etosighịm, etosighịm k'ị bata n'im'obi mo Chineke mo, etosighịm k'ị bata n'im'obi mo Maka njọ mo, etosighịm k'ị bata n'im'obi mo Dinwenu kwuonu sọ okwu n'obim gaadịrị m Dinwenu kwuonu sọ okwu n'obim gaadịrị m VERSE 2 Chukwu Nwa si n'igwe gbadata n'ụwa Weer' onwe ya mee nri mara mma Achịcha nke ndụ, nri mara mma Ọ tara ahụhụ nwụọ nwụ mak'anyị Weer' ọbara ya dị oke ọnụ gbapụt' anyị na njọ Kristi n'akpọ anyị ụmụnne ya, ndị enyi ya Ndị ọ hụrụ n'anya, sị anyị bịa nara ya VERSE 3 N'ezie Jeeso mo ị bụ nri ọma N'ezie Ahụ n'Ọbara Kristi bụ nri ọma n'enye ndụ N'ezie Jeeso bụ nri ọma N'ezie Jeeso bụ achịcha ndị Muozi Bịa nara ahụ ya rie Bịa, ọbara ya nụọ Ọ bụ ezi ihoriri n'ezie Ọ bụ ezi ihe ọṅụṅụ Nri ọma n'enye ndụ

Download the sheet music

Leenu Nwaturu Chukwu

Leenu Nwaturu Chukwu

By Fr Stanley Orazulike
Solfa
Igbo
4 pages
8 Downloads
Communion Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want