Full Lyrics
REFRAIN
Leenu Nwa atụrụ Chukwu
Achịcha ndị ọma nke si n'igwe gbadata n'ụwa
Ọ bụ nri ọma
Kristi nyer' anyị na Eucharistia dị asọ
Sị anyị rie k'anyị wee nwee ndụ ebeebe
K'anyị jeenu nara ya n'ihi na ọ bụ nri ọma
Anyị nwere isi ọma bụ ndị n'eri ya
VERSE 1
Etosighịm k'ị bata, O Dinwenu n'im'obi mo
Etosighịm, etosighịm k'ị bata n'im'obi mo
Chineke mo, etosighịm k'ị bata n'im'obi mo
Maka njọ mo, etosighịm k'ị bata n'im'obi mo
Dinwenu kwuonu sọ okwu n'obim gaadịrị m
Dinwenu kwuonu sọ okwu n'obim gaadịrị m
VERSE 2
Chukwu Nwa si n'igwe gbadata n'ụwa
Weer' onwe ya mee nri mara mma
Achịcha nke ndụ, nri mara mma
Ọ tara ahụhụ nwụọ nwụ mak'anyị
Weer' ọbara ya dị oke ọnụ gbapụt' anyị na njọ
Kristi n'akpọ anyị ụmụnne ya, ndị enyi ya
Ndị ọ hụrụ n'anya, sị anyị bịa nara ya
VERSE 3
N'ezie Jeeso mo ị bụ nri ọma
N'ezie Ahụ n'Ọbara Kristi bụ nri ọma n'enye ndụ
N'ezie Jeeso bụ nri ọma
N'ezie Jeeso bụ achịcha ndị Muozi
Bịa nara ahụ ya rie
Bịa, ọbara ya nụọ
Ọ bụ ezi ihoriri n'ezie
Ọ bụ ezi ihe ọṅụṅụ
Nri ọma n'enye ndụ