Full Lyrics
REFRAIN
Lee ụlọ Gị Chukwu.
Lee ụlọ Gị nke a gozie ya.
Ka ọ bụr' eb' obibi Gị (dị nsọ) ụlọ nsọ Gị,
ebe ụmụ Gị g'anọ mgbe niile
n'efe Gị, ofuf' ọma.
VERSE 1
Tata anyị ezukọla (Chineke)
rara ụlọ nsọ nke a tinye Gị n'aka.
Site n'aka nnukwu ụkọchukwu Gị,
dịka nwa Gị Solomon siri mee
n'agba ochie.
VERSE 2
Gozie Eze Ker'ụwa ụlọ nsọ Gị,
bịa mee ya ka ọ bụrụ eb' obibi Gị dị asọ,
ebe agbụrụ David g'anọ achụrụ Gị aja.
VERSE 3
Too ntị n'ala Chukwu dị elu
nụrụ ekpere n'arịrịọ nw'odibo Gị
n'arịọ doo biko meenu Chukwu ka
Onye bịara n'ụlọ nsọ nke a
ịchọ iru Gị n'obi ọcha
nweta ih' ọ n'achọ.
VERSE 4
On this house Your calling Lord,
May it come to us each day;
On this house Your calling Lord,
May it come and lead the way.
Filling us with nobler yearnings Lord,
Calling us to live in You;
On this house Your calling Lord,
May it come each day anew.