Full Lyrics
REFRAIN
K'anyi kulienu, k'anyi kulie nu
jee nara Dinwenu Jesu:
onye nọ na Sacramenti
nke Eucharistia dị nsọ.
VERSE 1
Dinwenu Jesu onye ebere ya dị okpu,
si n'oriri nsọ naeme
ka okwukwe n'esiwany' ike.
VERSE 2
Ọbara dị oke ọnụ o jiri gbapụt' anyị
n'ugwu Kalvari
ka o n'eny' anyị na Sacramenti
nke Eucharistia dịrị ya ebebe!
VERSE 3
Ony' ọbụla g'eri achịcha nke a,
ya cheta na ọ bụ Kristi nwa nke Chukwu
ka o n'eri!
VERSE 4
K'anyi were nu ezi obi
na ịhụnanya n'asọpụrụ Jesu
onye zoro na Sacramenti
nke Eucharistia.
VERSE 5
Otito otito dịrị Nna,
dịrị Nwa na Mmụọ Nsọ,
otito dịrị ya ebebe,
otito.