Full Lyrics
CHORUS
Kụnie nụ k'anyị jee n'Altar Chineke
K'anyị jee nara nụ Ahụ Jesu n'Ọbara ya
Nri ndị ọma n'enye ndụ
Chukwu kwadooro ndị hụrụ ya n'anya
VERSE 1
Onye g'anata Jesu g'abụ onye dị ọcha
Onye aka ya kwụ ọtọ
Onye ebughị njọ n'obi
Onye ihe ya n'asọ Chukwu
VERSE 2
Dinwenu kwuru sị "Ahụ m bụ ihe oriri ezie,
Ọbara m bụ ihe ọṅụṅụ"
K'anyị jee n'Altar nara ya
K'anyị jee nara nụ Dinwenu
VERSE 3
Onye bu njọ n'obi anatakwala Jesu
N'oriri dị asọ
Chọba Chineke dozie ndụ gị
N'ihi na onye bu njọ n'obi nara Dinwenu
Otufuela ndụ nar' ọnwụ
VERSE 4
Ahụ na Ọbara Jesu bụ ihe dị ok'ọnụ
Ị nata ya Jesu biri n'ime gị
Ihe nile ezusiwoo
Ke aṅụrị bụ nke gị
VERSE 5
Jesu,
Oseburụwa biko bịa biri n'ime m Chukwu Nna
Ezi Nna biko doo m nsọ
Oseburụwa biko bịa biri n'ime m