Full Lyrics
Chineke mo, Onye nwe mo
Chukwuọma, Ọ bi n'igwe
Bịaram n'iru Gị, inye Gị ekele
Nara ekele, nar'otito, Ogaranya ngada
Anam aja Gị mma Nna m n'igwe ị h'ọga.
Onyinye buribu kam ji bja Chukwu
Soro Gị eh! n'ime ndụ mo mebe
Ker'ụwa chọọ ya mma, were m mee ihe dị Gị mma
K'osi sọ Gị Chukwu Ọkaka eh! ị h'ọga
Soro Gị eh! N'ime ndụ mo mebe k'osi sọ Nna,
K'osi sọ Chi mo
Chineke Nna mo Ọ dịm mma, k'osi sọ Chukwu,
Ọdịbazịa n'ọ bụ
Ya nwe ụwa, n'ọ bụ Ya kere mmadụ,
Chineke Nna mo Ọ dịrị m mma
Ihe nile dị n'ụwa m'oji, m'ọcha Ọ dị m mma,
Ụwa Ọ dịrị m njọ, agam atụrụ Gị mmanma n'obi ọcha.
Ngozi Gị, Chineke ke k'Ọ geme
Nna, Ọ rụgo maka, eb'ọ masịrị Gị
Sọ Nna, k'osi sọ Nna m'o
Chineke Nna mo Ọmasịrị mo
K'osi sọ Chukwu, Ọmasịrị mo
Ọ bụghị rịịgbaka mbọ n'ezie bu ya bu n'ego e kwe nkputa.
Hem, hem, hem
Chetakwa n'ih'ụwa si n'akalaka.
Hem, hem, hem
Ụfọdụ n'at'ahụhụ n'ụwa, echere Chi ha.
Hem, hem, hem
Emeka t'Ọ dị k'adịgh'eme
Aga m agbar'egwu bu r'onyinye m, wee bja n'iru Gị;
Tibe ịgba, egwu daba, k'anyi ga n'iru Nwa Chineke,
Ọmasị Gị Chineke Nna mo, Ọmasịrị mo
Nke Chineke Nna mo Ọmasịrị mo
Tiberenụ m'egwu n'aga m'agba y'agba mgbe nile
Ekwere mo Oge Chukwu kacha mma n'ụwa.
Ngozi Chineke erusago m ka mmiri eh! Lee amara ya zur'oke na ndụ mo
Aga m agbar'egwu bu r'onyinye m, wee bja n'iru Gị,
Tibe ịgba, egwu daba k'anyi ga n'iru Nwa Chineke
Ọmasị Gị Chineke Nna mo Ọmasịrị mo
Nke Chineke Nna mo Ọmasịrị mo
Tiberenụ m'egwu n'aga m'agba y'agba; mgbe nile
Ekele kam ji bja k'osi sọ Chukwu.
Egwu ọyọrịma kam ji bja n'iru Gị Nna, k'osi sọ Chukwu.
I kele Gị n'ih'in'eme na ndụ mo k'osi sọ Chukwu.
Ahụhụ bja na ndụ mo Agam ata baru ya n'ọ bụ uche Gị k'osi sọ Chukwu
An̄ụrị bja na ndụ mo agam an̄ụrịba n'ọ k'osi sọ Gị k'osi sọ Chukwu
K'osi sọ Chukwu, k'osi sọ, k'osi sọ Chukwu
Chineke Nna mo Ọ masịrị mo
Eh! Ọ masịrị mo
Eh! mgbe nile