JESU NRIOMA by Reuben C. Igwe — Lyrics

Reuben C. Igwe Igbo Communion Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Oh Jesu Kristi Onye nchedo nke ndi nọ n'nsogbu Jesu m oh, Onye zoro oke n'udi achicha na mmanya Jesu bia, bia, bia, bata n'imem Jesu k'I chebe mkpur'obi m oh VERSE 1 Nri ndụ ọma n'enye ndụ, Jesu nwa Chukwu bata n'obi m oh Achịcha nke si n'igwe bata oh n'obi m oh Ony'ọbụla naatara gị oh agagh'anwụ n'ata ọnwụ mancha I bi n'ime ya ruo n'ụw'ọzọ. VERSE 2 Jesu Nwa Chukwu bụ ony'a n'akpọku o zangb'akporo ya Nwa Chineke anagh'ekwe nkwa, lachigh'azu Buru mkpa gị nile kọsara Chineke n'oriri nsọ. Ọ g'amụọlụ gị ma nyeg'i ihe n'achọ. VERSE 3 Agụụ gị Chineke n'agụụ mkpur'obi m oh Agụụ gị Nna n'agụụ mkpur'obi m oh Dika agụụ mmiri si agụụ nne ele Otua ka m si achọ gị Chineke nke Jekob.

Download the sheet music

JESU NRIOMA

JESU NRIOMA

By Reuben C. Igwe
Solfa
Igbo
2 pages
6 Downloads
Communion Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want