Full Lyrics
CHORUS
Dinwenu Jesu naakpọ m,
Ọ naakpọ m mana etosighị m inata ya.
Kwuo sọ okwu obi m gaadịrị rị.
Kwuo sọ okwu obi m gaadịrị rị.
VERSE ONE
Dinwenu Jesu kwuru sị,
A bụ m achịcha dị n'ndụ nke si n'igwe.
Onye riri ya n'ezie,
Ọ g'enwe ndụ ebebe.
VERSE TWO
Dinwenu Jesu kwukwara sị,
A bụ m ụzọ eziokwu na ndụ.
Onweghị onye nwer'ike ịbịa kwute Nna,
Bere sọ m'ọ sitere na m.
VERSE THREE
Dinwenu Jesu,
M rịọ ma, m rịọ ma Jesu, m rịọ ma.
Bata n'ime m ka ị bini,
Bata oh ka ị bini.