Full Lyrics
[REFRAIN]
Jesu Achịcha n'enye ndụ,
Kunie bia nara ya.
Nri si n'igwe wee bia,
na Kristi n'akpọ anyị o.
[VERSE 1]
N'Jesu kwuru sị,
Onye ọbụla riri ahụ m o,
n'ukwa ọbara m o,
Onye ahụ g'enwe ndụ ebe ebe n'ime ya.
[VERSE 2]
Jesu bụ achịcha ọma si n'igwe were bia,
K'anyị kunie nụ, k'anyị kunie nụ, k'anyị kunie nụ,
Jee nara ya.
[VERSE 3]
Bata n'ime m o Jesu zuo m ahụ ri,
Biri n'ime m n'obi m u chọrọ gị.
Ọ bụ ebe dị ọcha Jesu bata
n'obi m u chọrọ gị.
[SOLO]
Jesu m o,
Obi m u chọrọ gị,
Anam achọ si gị,
Ke k'i chiwa n'obi m o,
saachapụ m o Njọ nke m mere gị,
Chukwu nna m o! bata obi
si Jesu n'ọna Eucharistia bata,
N'ime obi m Jesu Christi bata o,
Onye n'enye ndụ n'a hụ ike bia o,
Chukwu n'enye ike bata,
Bisi n'obi m o.