Full Lyrics
[REFRAIN]
Ọtịto dịrị Chineke
n'elu kachasị e
Ọtịto dịrị Chineke n'elu kachasị e
ma ọtịto dịrị Chineke
[VERSE 1]
Udo dịrị ndị amara gị dị mma
Udo dịrị ndị mmadụ
Udo dịrị ndị amara gị dị mma n'elu ụwa
[VERSE 2]
Anyị aja gị mma
Anyị atọba gị
Anyị akpọ isiala nye gị
Anyị anye gị ọtịto
n'ihi ukwu dị mma ọtịto gị
[SOP / ALTO]
Dinwenu Chineke Eze nke igwe
Chineke Nna ji ike niile
Dinwenu Jesu Kristi
Sọ otu nwa Chineke mụrụ
[SOP AND ALTO]
Dinwenu Chineke Nwa atụlụ nke Chineke
Nwa nke Nna ọtịto dịrị Chineke
[SOPRANO AND ALTO]
Ị naewepụ njọ nke ụwa meere anyị ebere
Ị naewepụ njọ nke ụwa nabata arịrịọ anyị
Gị onye naanọ n'aka nri Nna meera anyị ebere
n'ihi na sọ gị dị nsọ
sọ gị bụ Dinwenu
sọ gị Jesu Kristi
kachasị enu n'ọtịto dịrị Chineke
[CODA]
Amen Amen Amen Amen