Full Lyrics
VERSE 1
Olu nke Chukwu n'ada n'im'obi sị nwam ihe ndị a dị njọ,
nwam ihe ndị a dị njọ, ejesola ha nwam.
M'olu nk'ekwensu n'ada n'ime ntị sị nwam ihe ndị a dị mma,
nwam ekwela ha, m'ekwensu n'asị nwam ihe ndị a dị mma, nwam, ekwela ha.
CHORUS
Ihe ndị a dị njọ Chukwu n'asị
ihe ndị a dị mma b'olu nk'ekwensu
M'ọ n'aka ny'ụtọ ịnụ nk'ekwensu
n'ịsorolu ya n'ekwu n'asị
ihe ndị a dị mma, dị mma, dị mma, dị mma.
VERSE 2
Mgb'anyị naeje kwuru njọ Chukwu naasị nwam
Ihe ndị a dị njọ nwam, ihe ndị a dị njọ, ejesola ya nwam.
M'onyeiro nke mmadụ b'ekwensu naasị nwam
Ihe ndị a dị mma nwam, jisi'ike me ya.
VERSE 3
Mgb'anyị n'ew'ih'ony'ọzọ Chukwu naasị nwam,
Ihe ndị a dị njọ nwam, ihe ndị a dị njọ, emekwela ya nwam
M'onye naafu anyị b'ekwensu naasị nwam,
Ihe ndị a dị mma nwam, ọ ga emeba gị ezi nwam.
VERSE 4
Mgb'anyị naekwutọ, atakwu Chukwu naasị nwam,
Ihe ndị a dị njọ nwam, ihe ndị a dị njọ ekwukwala nnọ nwam
M'onye naemebi iwu b'ekwensu naasị nwam,
Ihe ndị a dị mma nwam, ọ naewetara ezi nwam.
VERSE 5
N'im'ekworo n'ikp'asị Chukwu naasị nwam
Ihe ndị a dị njọ nwam, ihe ndị a dị njọ rapụ kwa n'anya nwam
M'onye nduhie n'ụwa b'ekwensu naasị nwam,
Ihe ndị a dị mma nwam, anya lar'anya ezi nwam.