IFUNANYACHUKWU by Alex Ugwu (OZIGE) — Lyrics

Alex Ugwu (OZIGE) Igbo Hymns Celebrations Recessional / Dismissal Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Ọ bụ onye g'afụ anyị n'anya ka Chukwu, Chukwu nwụrụ maka mụ na gị? Ọ bụ onye g'afụ anyị n'anya ka Chukwu, Chukwu kere ụwa mụ na gị? Ọ bụ onye g'afụ anyị n'anya eh! Ifunanya ya barụ ba, Ifunanya Chukwu, Chukwu bụ ọdị n'obi mo. Chukwu bụ chijindụ mo, Ifunanya Chukwu, Ifunanya Chukwu, Ifunanya Chukwu, Chukwu bụ ọdị n'obi mo. VERSE 1 Chukwu jindụ mo, Chukwu ji ụwa mo, Chukwu dimma, Chukwu bụ papa, ọ bụ ya fụrụ anyị n'anya. Ọ bụ onye fụrụ anyị n'anya dịka Chukwu nna? Ifunanya Chukwu, Chukwu bụ ọdị n'obi mo. VERSE 2 Chukwu bụ ezi Chukwu, Chukwu bụ ezi nna mo, Chukwu dị obi ebere, Chukwu naagbaghara. Chukwu kerụ ụwa, Chukwu nụ uru ụwa. Ifunanya Chukwu, Chukwu bụ ọdị n'obi mo. VERSE 3 N'ụtụtụ, n'efifie, N'abani ọ bụ sọ Ifunanya Chukwu. N'anjo mo, n'ọdịmma sọ, N'amimi ọ bụ sọ Ifunanya Chukwu. Na mbere de ifunanya ya barụba n'ime ndụ mo ee! Nwanne m ifunanya nke Chukwu barụba, Ya ka m ji egori, ya ka m ji biri, Nekene, nekene, nekene, Ifunanya. Nekene nụ nụ nụ Ifunanya Chukwu, Chukwu bụ ọdị n'obi mo.

Download the sheet music

IFUNANYACHUKWU

IFUNANYACHUKWU

By Alex Ugwu (OZIGE)
Solfa
Igbo
4 pages
5 Downloads
Hymns Celebrations Recessional / Dismissal Hymns
0 0

More lyrics you may want