Full Lyrics
REFRAIN
O wube, wube ife Chukwu, wuru.
Gabazianụ, ife Chineke m o.
O chụsasịa ọchịchịrị n'ime ndụ m o.
O buru ngọzi nke m o ife Chukwu,
Ngọzi nke m abịago ife Chukwu.
O chakwasa m o ife Chineke Nna m o.
VERSE 1
Chukwu bụ ike m o, Ọ n'enyere m aka,
Chukwu bụ ndụ m o, Ọ n'azọpụta m o.
Chukwu bụ ife m o. O! Chi m o n'edu m eje, e du m ala;
Ife m o mara mma wube, wube.
VERSE 2
Chineke elekwasago m anya ebere Ya.
Ọ ji ngọzi Ya gbaa m okirikiri.
Weri ife Ya chagide m o si m wube.
VERSE 3
Ife nke Chukwu nyere m g'ewugide.
N'ebe nile m n'eje Ọ g'ewugide.
N'ihe nile m n'eme Ọ g'ewugide.