Full Lyrics
REFRAIN
Ị naasaghe aka gị Onyenweanyị
naenye ha ihe niile naakpa ha.
VERSE 1
Onyenweanyị ihe niile i kere gaekele gị
ndị kwere na gị gaagọzi gị
ha gaekwupụta ebube nke alaeze gị
ma kwupụta ịdị ike gị.
VERSE 2
Anya ihe dum e kere eke dị n'ebe ị nọ
ị naenye kwa ha nri n'oge ha
ị naasaghe aka gị
naenye ihe niile naakpa ha.
VERSE 3
Onyenweanyị dị mma n'ụzọ ya niile
Ọrụ aka ya niile naegosi ịhụnanya ya
Onyenweanyị nọ nso ndị niile naakpọku ya
ndị si ezi obi naakpọku ya.