Nwaturu Chukwu by Harcourt Whyte — Lyrics

Harcourt Whyte Igbo Agnus Dei (Lamb of God) Communion Hymns Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

VERSE 1 Uwa nile furu na njọ, n'ọchichiri: Madu nile toro na njọ, n'ọchichiri: Ok'iwe nke Chukwu diri madu, Diru kwa n'ọbibia nke Nwa nke Chukwu. CHORUS Nw'aturu Chukwu, ezi Nw'aturu Chukwu, Onye ne bupu nmehie nke uwa: Ọbibia gi bu ndu bu kwa nzọputa; Ọbibia nke ala eze nk'eluigwe. K'ụwa nile ṅuria, k'a bu juput'uwa; Ṅuria, n'ihi n'ụwa enwe w'Onyenzọputa. VERSE 2 Gini kwa ka mu onwem gaekwu? Ol'ihe ka m'onwem gaeme? M'ọburu na Nwa nke Chukwu abiagh? 'Buru kwa mgbaghara nmehie adigh? VERSE 3 Ọgbọnmehie, ewo, ugbu! Iberib'egb'umu madu! Ha ju wo amara ahu di nsọ, Kpọchi kwa nti n'okwu nke Chukwu di nsọ. VERSE 4 Umu ndikom irin'abua, Bu ndi obi ha ghere oghe, Natara ozi ahu nke si n'igwe; Wusa mo ha n'ụkwụ Eze nk'ebube. VERSE 5 Okwu ha natara bu nka, Ozi ha naezisa bu nka, K'ụwa nile nes'uzọ nke Jisus; N'ihi na al'eze nk'eluigwe naabia.

Download the sheet music

Nwaturu Chukwu

Nwaturu Chukwu

By Harcourt Whyte
Staff & Solfa
Igbo
2 pages
6 Downloads
Agnus Dei (Lamb of God) Communion Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want