Full Lyrics
REFRAIN
Otito diri Chineke n'enu kasienu.
N'uwa udo diri ndimma, ndi nwer' obi oma.
Otito diri Chineke n'enu kasienu.
N'uwa udo diri ndimma, ndi nwer' obi oma.
1ST TIME
Anyi ajaa gị mma, gọzie gị, anyi esekpuworo gị.
Anyi etoo gị, kenee gị n'ihi nnukwu ebube gị!
Oseburụwa Chineke Eze nke enyigwe!
2ND TIME
Chukwu Nna ji ike niine, Dinwenu Jesu Kristi.
Sọ otu nwa Chineke nyere, Dinwenu Chukwu!
Nwaturu nke Chineke, Nwa nke Nna!
3RD TIME
N'ekpochapụ njọ nk'ụwa meere anyi ebere.
N'ekpochapụ njọ nk'ụwa nara arịrịọ anyi,
Onye nọ n'aka nri Nna, meere anyi ebere.
4TH TIME
N'ihi na sọ gị di nsọ, sọ gị bụ Dinwenu.
Sọ gị o Jesu Kristi kacha di enu, gị na Muọ n'ebube Chukwu Nna.
Ise! Ise! Ise! Ise! Ise! Ise! Ise!!