Full Lyrics
CHORUS
Chukwu, ihe mekatam u m hara gị,
Ihe mekatam u m chezo gị,
Gbaghara Chukwu nna, gbaghara Chukwu m o.
Chukwu ihe mekatam u ndanye n'ọnwụ nwa,
Ihe mekatam u ndanye n'ahụhọ
Gbaghara Chukwu nna, gbaghara Chukwu m o.
Chukwu anyị bụ ụmụ gị naarịọ gị
Nye n'anyị ke ji ajụ njọ n'ọnụ ụwa,
Nke ji adị nso.
Biko ranyị na njọ gbagharanyị
Papa gbagharanyị,
Chi ji ndụ, Chi b'ebere gbaghara.
VERSE 1
Chukwu o b'ebere, meere ya nyị ebere,
M'ihi bụ mmadụ, fịabanyị ahụ.
Nye n'anyị ike ji ajụ njọ,
Anyị achọghị ịnaachị na ya,
Nya k'anyị ji arịọ gị o.
VERSE 2
Papa ọ n'ọk'atọ dị ka m naadazi mba,
Mana obi m niile chọrọ ime uche gị.
Nye n'anyị ike ji ajụ njọ,
Anyị achọghị ịnaachị na ya,
Nya k'anyị ji arịọ gị o.
VERSE 3
Ezi Chukwu biko, ezi Chukwu gbaghara,
Biko ezi Chukwu gbaghara, ewo gbaghara m o.
O ezi Chukwu biko gbaghara,
Ezi Chukwu biko gbaghara,
Ezi Chukwu biko gbaghara,
Biko, biko gbaghara m o.
Biko, biko, biko m o bikozienụ o.