Full Lyrics
REFRAIN
Leenu Nwaturu Chukwu, achịcha ndị ọma,
Nke si n'igwe gbadata n'ụwa, lee ọ bụ nri ọma.
Kristi nyer' anyị na Eucharistia dị asọ,
Sị anyị rie k'anyị nwee ndụ ebebe.
K'anyị jeenu nara ya n'ihi na ọ bụ nri ọma.
Anyị nwere isi ọma, ndị n'eri ya.
VERSE 1
Etozighị m Dinwenu k'ị bata.
Chineke m o, etozighị m k'ị bata.
Maka njọ m o, etozighị m k'ị bata.
Dinwenu biko kwuo n'obi m gaadịrị m mma.
Dinwenu kwuo nu sọ okwu n'obi m gaadịrị m mma.
VERSE 2
Chukwu Nwa si n'igwe,
Ọ tara ahụhụ.
Gbapụta anyị na njọ,
Kristi n'akpọ anyị ụmụnne ya,
Ndị enyi ya, ndị ọ hụrụ n'anya sị anyị bịa nara ya.
VERSE 3
N'ezie ahụ n'ọbara Kristi bụ nri ọma n'enye ndụ.
N'ezie Jesu bụ nri ọma.
N'ezie Jesu bụ achịcha, nri ndị mmụọ ozi.
Bịa nara ahụ ya rie.
Bịa nara ọbara ya nụọ.
Ọ bụ ezi ihe oriri n'ezie.
Ọ bụ ezi ihe ọṅụṅụ, nri ọma n'enye ndụ.