Full Lyrics
[REFRAIN]
Onye n'azụ m bụ Chukwu, Chukwu igwe ndị agha,
Onye n'azụ m bụ Chukwu, n'k'igwe ndị agha.
Onye nanị Ya nwe ike, Onye nanị Ya dị nsọ,
Onye nanị Ya bụ Chukwu n'ụwa ma n'igwe!
Onye nanị Ya bụ Odogwu akata aka, Chineke igwe ndị agha,
Onye n'azụ m bụ Chukwu n'k'igwe ndị agha.
[VERSE 1]
Chineke naazụ m ka atụrụ,
n'ezi okwu Ọ dịghị ihe kọrọ m,
N'ebe ahịhịa ndụ dị ka Ọ n'eme kam makpuru,
n'ezi okwu Ọ dịghị ihe kọrọ m,
n'akụkụ mmiri ndụ ka Ọ n'enye m ezumike,
n'ezi okwu Ọ dịghị ihe kọrọ m,
Ọ n'enye ndụ na mkpụrụobi m,
Ọ n'enye ndụ na mkpụrụobi m.
[VERSE 2]
Ọ n'edu m n'ụzọ, kwụ ọtọ,
Ọ n'edu m, Ọ n'edu m dị ka
Aha Ya si dị, Ọ n'edu, Ọ bụrụ nam ga
ga n'ọchịchịrị, Ọ n'edu, t'egwu ọbụla
agaghị atụ m, Ọ n'edu, I ji mkpara Gị
nonyere mụ ebe ahụ, Ọ n'edu m, Ya k'i ji enye m agbamume, Ọ n'edu m.
[VERSE 3]
I kwadooro m oriri n'iru ndị iro m,
I kwadooro m oriri n'iru ndị iro m,
O Jesu, Ude dị mma k'I wee re wee tee m n'isi,
iko m ejula n'ọnụ.
O S'Messiah bụ Onye n'azụ m kwa mgbe, kwa mgbe,
Messiah m, Messiah bụ Onye n'azụ m hoo haa!
Messiah bụ Onye n'azụ m kwa mgbe, Ọ dịghị ihe kọrọ,
Messiah bụ Onye n'azụ m lee! lee!
[SOLO]
Onye ke r'ụwa
Kpara Chineke bụ Onye n'azụ m, hoo! haa!
Anụrụ anụ rụ ndụ bụ Onye n'azụ m, hoo! haa!
Ọdụm egwu Juda b'Onye n'azụ m, hoo! haa!