Full Lyrics
Onye ọbụla gee ntị nụr'okwu anyị jiri bịa.
Onye ọbụla gee ntị maka ndụmọdụ!
Ekwugh'ekwu mere okenye, mee ọnụ!
Ekwu anụghị mere ntị, mekwa nwata!
Anyị bịalụ disi taịmụ k'anyị chie unu wọning!
Makana unu bụ mmadụ awakazịa anya!
Unu chere na Chukwu dị nzuzu wee kee oji n'ọcha?
Unu welụ nwayọ k'iwe Chukwu wee zenata.
Akọ bụ ndụ! K'anyị welụ akọ n'uche biri.
Ekwela ka ụmụ ụwa ghọgbue gị, ezi nwanne m o!
Gbanarị akwa' rịrị o! Akwa n deeli o!
Ị h'ị men'ị mena, nwanne m, kwub'aka gị ọtọ!
Ihe anyị n'ekwu bụ k'anyị mebe omume ọma,
bibe ezigbo ndụ, kaba ezigbo nka.
Ọnwụ ike n'adị njọ, ma ọmala, Eh! Egwu Ọjọlị ma!
Ọnwụ ike n'adị njọ, ma ọ k'ọchịchọ sọ ebute ha.
Nwayọ, nwayọ k'eji alach'ofe dị ọkụ.
Ihe onye metara na esokwa ya.
Nke onye butere, ọbụrụ n'isi ya.
Imere nma, imere njọ, Chukwu ma.
Ị h'ị men'ị mena, nwanne m, kwub'aka gị ọtọ!
Okenye anagh'anọ n'ụlọ, ewu amụọ n'ọgbụ!
Okenye anọghị anọ mmiri amaa nkụ eji esi nri.
Isi awọ n'adị ụtọ ma iji d'ọgụ n'ọfọ.
K'anyị were nwayọ k'ofe lolu a lozuol'anyị nri.
Ok'ọchịchọ e gbug'ụwa, k'anyị kwuzie ya gbowam!
Ewu n'ọkụkọ chọrọ ego, nke taa nke echi!
Ka ha naachụ ego, bụ ka ego n'agba!
Ụfọdụ emego arụ, ebe ha n'achụ ego n'ike!
Akọ bụ ndụ! K'anyị welụ akọ n'uche biri.
Ekwela ka ụmụ ụwa ghọgbue gị, ezi nwanne m o!
Gbanarị akwa' rịrị o! Akwa n deeli o!
Ị h'ị men'ị mena, nwanne m, kwub'aka gị ọtọ!
Odoro anya na ihe siri ike.
Oke na ngwere makwara n'obodo adịghị nma.
Ma n'anyị g'ejizi na ọkọ n'akọ, kọ baa' nya?
Nwanne m lotaba, akwa agbat'obi n'echukw'ụra.
Akọ bụ ndụ! K'anyị welụ akọ n'uche biri.
Ekwela ka ụmụ ụwa ghọgbue gị, ezi nwanne m o!
Gbanarị akwa' rịrị o! Akwa n deeli o!
Ị h'ị men'ị mena, nwanne m, kwub'aka gị ọtọ!
Ihe anyị n'ekwu bụ k'anyị mebe omume ọma,
bibe ezigbo ndụ, kaba ezigbo nka.
Egwu Amala, Eh! Egwu Ọjọlị ma!
Ọnwụ ike n'adị njọ, ma ọ k'ọchịchọ sọ ebute ha.
Nwayọ, nwayọ k'eji alach'ofe dị ọkụ.
Ihe onye metara na esokwa ya.
Nke onye butere, ọbụrụ n'isi ya.
Imere nma, imere njọ, Chukwu ma.
Ị h'ị men'ị mena, nwanne m, kwub'aka gị ọtọ!
Serem! Serem! Egw'ukwu. Ayaya!
Egwu ọma! Iya! Iyom! Iyom!
Egwu anyị jia ba! Gbaba ya, welu ya,
lekw'egwu gba ba! Iya! Iyom! Iyom!
Egwu anyị jia ba!
Egwu, egwu, Ọyọrịma b'egwu. Iyo mmh Ah! Egwu!
Serem, Yọrịmanu, egwu ọyọrịma! Iyo mmh Ah! Egwu!
Onye kpatara nkụ ahụhụ, ọbụ ya kpọrọ ngwere ọlịlị!
Ogologo okpu n'aka nma n'isi onye nwe ya!
Ụgwọ ọ luony'a rụrụ ala, ka nma n'isi onye metere ya!
Agha akalụ aka, nwanne m, atụalụ ọmalụ,
ọmal'atụalụ ofeke, ofeny'i si n'ọhịa!
Ụwa bụ ahịa, ihe onye zụtara buru laa.
Uche bụ akpa, onye na nke ya.
Taa bụ ije, echi bụ akụ kọ.
Echi dị ime! Anyị g'ala!