Full Lyrics
Ihe omimi omela, weli g'anya gị n'elu obe.
Ọ bụ gịnị ka O mere?
Cheta kwa, cheta kwa, cheta kwa o,
Cheta kwa, n'ọ bụ maka njọ m o, Jesu m o,
nwụrụ n'elu obe, Jesu nwụrụ n'obe, n'ihi, n'ihi
mụ na gị o nwa nne m biko nọkwanụ cheta, cheta kwa o na
bụ maka njọ anyị ka o ji taa ahụhụ, nwụọ n'elu obe.
Lee nụ ka Jesu si wee bịa n'ụwa, rụọ ọrụ dị mma, O rue ebube.
Lee nụ k'ụmụ ụwa si wee kwụọ Ya ụgwọ Ọ rụọ ọma ọ rụọ o.
Ha mara ya ụra o, ha pịara ya ụtarị.
Ahụhụ tara, ahụhụ Jesu tara, ahụhụ
Ahụhụ o tara n'ihi anyị Jesu m o Jesu.
Ọ na na bụ aja dị oke ọnụdọ.
Pụta nara Jesu nri naenye ndụ nọ na Eucharistia dị nsọ.
Ọ bụ ya bụ aja dị nsọ.
Onye dị ngọzi, Ọ bụ ya bụ aja dị nsọ.
Aja dị oke ọnụdọ, Ọ bụ ya bụ aja dị nsọ.
N'ezie Ọ bụ ya bụ aja dị nsọ.
K'Achịcha nke ndụ biri n'ime m, amam na
ekwesịghị m k'am nata Gị.
Jesu m o Jesu abụ m nke Gị.
Sọ Gị bụ chi m o n'ezie.
Pụta nara Jesu nri naenye ndụ nọ na Eucharistia dị nsọ.
Ọ bụ ya bụ aja dị nsọ.
Onye ọbụla a nata Gị n'ụzọ ziri ezi,
Onye ọbụla oh n'ụzọ ziri ezi Ọ gaenwe ndụ ebighebi,
Ọ gaenwe ndụ ebighebi.
Bịa bịa keta òkè na aja dị nsọ bụ Ahụ n'Ọbara Jesu na Eucharistia.
Ọ bụ nri n'enye ndụ ebighebi.
Pụta nara Jesu nri naenye ndụ nọ na Eucharistia dị nsọ.
Ọ bụ ya bụ aja dị nsọ.