Full Lyrics
[CHORUS]
Anyị arịọ Gị nara aja anyị,
Ezi Chukwu, Ezi Chukwu, nabata ya.
Were ya gozie ya, mekwaa ya Nna
K'ọ dị mma kwesị n'ị g'anara ya.
[VERSE 1]
Mgb'anyị n'erunyeere Gị aja obi ọma anyị,
Nke bụ ihe ala mịpụtara.
Ọ bụghị nkwụghachi ịhụnanya Gị,
Anyị enweghị ike ya.
[VERSE 2]
Mgb'ọbụl'anyị bụ ụmụ Gị gbakọrọ n'ihu Gị,
Ị chụrụ Gị aja.
Ka sị asọ k'anyị n'erunye ya maka ndị mmadụ niile,
Ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.
[VERSE 3]
Sọ Ngị bụ ndụ ndị kwere na Gị,
Ndụ ihe niile n'ụwa na n'eligwe.
Gosi anyị ụzọ nke ka mma,
Iji wee gosi Gị añụrị anyị na Gị.
[VERSE 4]
Ndị nso n'eji ukwe añụrị eto afọma Gị,
N'eto kw'ike Gị.
Kwere k'anyị soro ha too Gị oge niile,
Site n'aja anyị.
[VERSE 5]
Gozie anyị, gozie anyị, gozie, O Chukwu anyị,
Ndị n'achụrụ Gị aja.
Nar'anyị, nar'anyị, nara, O Chukwu anyị,
Aja nke onwe anyị.