Full Lyrics
REFRAIN
Iha kuko emeelanuo
Ony'obula gbabegwu!!
Kedu oja mo? egwu erie m'isi?
Kedu otigba k'anyi tiegwu o
Uwa nile golibenu o
n'amulu Eze uwa nile
K'anyi golibe
egwu oma eh! nuliba
Kristi abiago
Onyenzoputa nk'uwa!
Amulu ya n'ul'anu na Bethlehem Judea!
K'anyi jeenu, K'anyi jeenu, Kelee Eze uwa nile
Kristi mo Eze amulu ohuru
Onyenzoputa biago n'eluwa
Eze amulu ohuru
VERSE 1
Lee ka enibere ya n'agbuke
Lee Maria k'O ku nw'ohuru ya.
O kpar'Eze nk'udo
Emmanuel
Ony'ukwu, Onyenzoputanyi
VERSE 2
Kpakpando n'amuke
n'amuke n'igwe
O n'egosiywa eba ha amulu Jesu.
Ndi nch'atulu ji oso na ije gbagaba n'ul'anu Oge ha nulu ozi.
Ndi Eze ato si n'owuw'anyanwu bia ha n'ach'Ez'uwa.
Ha chotara ya nihi na Kpakpando n'amuke
VERSE 3
Ndi Muozi doo kwekenenu kw'athu unu
Kwer'ozo!
Wedata nwebube chineke n'im'obi ndi mmadu.
n'elu kach'elu
Udo n'im'obi ndi mmadu.
Kwebenu udo
Udo chineke udo diri ndi mmadu, ndihe ha naaso chukwu.