Esekpuorom Gị by Henry Junsala, R — Lyrics

Henry Junsala, R Igbo Benediction & Adoration Hymns Communion Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

VERSE 1 Esekpuorom Gị Chukwu dị na nzuzo, Onye nọ ezie, n'ụdị sacramenti. E jim obim nile kwere n'ihe omimi nkea Ke ka uche mmadụ mma. VERSE 2 Aka, ọnụ, n'anya, enweghike ịgwa anyị Eziokwu dị na sacrament dị nsọ Ọ bụ ntị n'anụ okwu Jesu, kwere Maka n'ọbụ Chukwu. VERSE 3 Ihe ncheta aja achụrụ na elu obe Achịcha dị ndụ na enye mmadụ ezi ndụ Mee ka obim si na Gị na enweta ndụ ya Ka ọ hụ n'Ị dị ụtọ. VERSE 4 Dịka nnụnụ nke an'akpọ Pelikan, N'eji ọbara ya na azụ ụmụ ya nile, O Jesu, sacha njọ m nile, Ọbara GịNke iji gbapụta ụwa. VERSE 5 O Jesu, Onye nọ na nzuzo na ihu m, Anam arịọ Gị nyem onyinye m chọrọ Ya bụ ka mụ na Gị hụ ihu na ihu Na otito nke eligwe.

Download the sheet music

Esekpuorom Gị

Esekpuorom Gị

By Henry Junsala, R
Solfa
Igbo
1 page
2 Downloads
Benediction & Adoration Hymns Communion Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want