Full Lyrics
[SOPRANO INTRO]
Erimeri eh! Erimeri eh!
Ahụ Kristi n'Ọbara Kristi bụ Ihe oriri ezie
Naranụ Kristi n'Ọ bụ Erimeri eh! Erimeri eh!
[KỌRỌS]
Erimeri eh! Erimeri eh! Erimeri eh! Erimeri
K'anyị jeenụ nara Kristi n'Ọ bụ Nri dị nsọ; Nri dị nsọ
Nri dị ụtọ; Nri dị ebube; Nri mara mma.
Detu Ya detu Y'ọnụ
Nwannem detu Y'ọnụ ka ị hụ na Kristi dị ụtọ n'Ọ bụ Erimeri.
[VERSE 1]
Ahụ na Ọbara Kristi bụ Ihe oriri ezie
na Ihe ọñụñụ ezie nke naenye ndụ ọkpụ;
anyị rie Ya, Anyị ñụọ Ya
Anyị ga enwe ndụ; ndụ nke ime mmụọ!
[VERSE 2]
Kedu ka nke a na Chukwu mere Onwe Ya Ihe oriri
kwa ịhụnanya
ka ịhụnanya na Chukwu mer' Onwe Ya Ihe oriri.
[VERSE 3]
Ahụ Kristi, Ọbara Kristi mo!
Ọ bụ nri naenye ndụ, ndụ ebighiebi
Ọ bụ nri naenye ike, nri ndị Ije naeri
Onye riri nri a; Ọ gaenwe ndụ ebighiebi
Ka anyị jee jee jeenụ je nara Ya
Ọ bụ nri ọma, Ọ bụ nri ọma eh.