Full Lyrics
REFRAIN
Ekwerem n'otu Chineke,
Nna ji ike niile,
Onye mere eluigwe na ala.
VERSE 1
Na ihe niile a pụrụ ịhụ anya,
Na ndị apụghị ịhụ anya.
Ya na n'otu Onyenweanyị, Jesu Kristi,
Sọ otu Nwa Chineke mụrụ:
Nna mụrụ tupu ụwa niile.
VERSE 2
Chukwu si na Chukwu,
Ihe si n'ihe,
Ezi Chukwu si n'ezi Chukwu,
A mụrụ amụ, emeghị eme,
Ya na Nna bụ otu ihe
n'ọdịdị ebighịebi ha jiri bụrụ Chukwu,
VERSE 3
Onye esi na Ya mee ihe dum.
Onye maka ihi anyị bụ mmadụ,
na maka ihi nzọpụta anyị,
siri n'eluigwe gbadata.
VERSE 4
O were ahụ na Vejin Maria site na Mmụọ Nsọ:
Ọ bụrụ mmadụ.
A kpọgbuo Ya n'obe n'ihi anyị n'oge ọchịchị Pọntus Paịlet,
Ọ taa ahụhụ, nwụọ e lie Ya.
M'Ọ bilitere n'ụbọchị nke atọ, ka Akwụkwọ Nsọ si kwu.
Ka Akwụkwọ Nsọ si kwu.
Ọ rọgọrọ na eluigwe, nọrọ n'aka nri Nna.
nọrọ n'aka nri Nna.
M'Ọ gaabịaghachi ọzọ n'ebube Ya,
ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe,
Onye ọchịchị Ya enweghị njedebe.
VERSE 5
Ekwerem na Mmụọ Nsọ
Dinwenu na Onye na enye ndụ:
Onye si na Nna na Nwa pụta.
Onye a na esekpuru, na etokọdọ Ya na Nna na Nwa:
Onye si na ndị amụma kwuo kwu.
VERSE 6
Ekwerem na Nzukọ nke dị otu, dị nsọ
bụrụ Katọlik na apọstọlik.
Ekwupụta m'otu mmirichukwu maka mgbaghara njọ ga.
Ana m'atụ anya
Mbilitenọnwụ ndị nwụrụ anwụ,
Na ndụ ụwa gaabịanụ.
Na ndụ ụwa gaabịanụ.
Na ndụ ụwa gaabịanụ.
Amen. Amen. Amen. Amen. Amen. Amen. Amen.