Missa Ifunanya Ekwere M N'otu Chineke by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Creed (I believe) Mass Settings Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN 1 Ekwere m n'otu Chineke Nna ji ike niile VERSE 1 Onye mere igwe n'ala, n'ihe niile a puru ihu anya na ndi a pughi ihu anya Ya n'otu Onyenweanyi Jesu Kristi, s'otu Nwa Chineke muru Nna muru tupu uwa tuwe niile, Chukwu si na Chukwu, Ihe si na Ihe Ezi Chukwu n'Ezi Chukwu A muru ya amu, emeghi ya eme, ya na Nna bu Otu ihe n'udi di ebighebi ha ji buru Chukwu Onye si na ya mee ihe dum, onye mak'ihi anyi bu mmadu Na mak'ihi nzoputa anyi, siri n'eligwe gbadata AD LIBITUM ACCAPELLA O weere ahu na Virgin Maria Site na Mmuo Nso O buru mmadu A kpogbuo ya n'obe N'oge ochichi Pontius Pilate O taa ahuhu, nwuo, e lie ya VERSE 2 Ma o bilitere n'ubochi nke ato ka akwukwo nso si kwu REFRAIN 2 O bilitere n'onwu O bilitere n'onwu o VERSE 3 O rogoro n'eligwe, no n'aka nri Nna Ma o gabia ghachi ozo n'ebube Ya ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu ikpe Onye Ochichi Ya n'enweghi njedebe Ekwere m na Mmuo Nso, Dinwenu na Onye n'enye ndu Onye si na Nna na Nwa puta, Onye a n'esekpuru N'etokodo Ya na Nna na Nwa, Onye si n'onu ndi amuma kwuo okwu Ekwere m n'otu nzuko nke di Otu di Nso buru Katolik buru kwapostolic E kwuputa m Otu mmiri Chukwu maka mgbaghara njo Anam atuanya, anam atuanya, anam atuanya Mbilitere n'onwu ndi nwuru anwu Na ndu uwa gabia nu Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen

Download the sheet music

Missa Ifunanya Ekwere M N'otu Chineke

Missa Ifunanya Ekwere M N'otu Chineke

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
2 pages
1 Downloads
Creed (I believe) Mass Settings
0 0

More lyrics you may want