EKWEM N'OTU CHINEKE (I BELIEVE IN ONE GOD) by Okwy Tony Umeh (Rev. Fr.) — Lyrics

Okwy Tony Umeh (Rev. Fr.) Igbo Creed (I believe) Mass Settings Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Ekwe m n'otu Chineke, Nna jị ike n'ile, Onye mere eluigwe n'ala. VERSE 1 Ekwe m n'otu Chineke, Nna jị ike nile, Onye mere eluigwe n'ala, n'ihe dum a naahụ anya, na ndị anaghị ahụ anya. Ya na otu Onyenweanyi, Jesu Kristi, sọ otu Nwa Chineke mụrụ: Nna mụrụ tupu ụwa tụwa nile. VERSE 2 Chukwu si na Chukwu, Ihe si na Ihe, Ezi Chukwu si n'Ezi Chukwu, a mụrụ amụ, emeghị eme. Ya na Nna bụ otu ihe n'ihe ha ji bụrụ Chukwu, Onye e si na ya mee ihe dum. VERSE 3 Onye maka ihi anyị bụ mmadụ na maka ihi nzọpụta anyị, siri n'eluigwe gbadata, o were ahụ na Virgin Maria site na Mmụọ Nsọ. Ọ bụrụ mmadụ, a bịa kpọgbuo ya n'obe n'ihi anyị n'oge ọchịchị Pontus Pilate. VERSE 4 Ọ taa ahụhụ, Ọ nwụọ, e lie ya. Ma Ọ bilitere n'ụbọchị nke atọ, ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo. Ọ rọgọrọ n'eluigwe nọrọ n'aka nri Nna. Ma Ọ gaabịaghachi ọzọ n'ebube ya, ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe. VERSE 5 Onye ọchịchị ya enweghị njedebe. Ekwe m na Mmụọ Nsọ, Onyenweanyi naenye ndụ; Onye siri na Nna na Nwa pụta. Onye a naesekpuru, naetokọdọ, ya na Nna na Nwa; Onye si na ndị Amụma kwuo okwu. VERSE 6 Ekwe m n'otu Nzukọ Nsọ Katọlik, na Apọstọlik, e kwupụta m otu baptism nke mgbaghara njọ. A na m atụ anya mbilite n'ọnwụ ndị nwụrụ anwụ, na ndụ ụwa gaabịanụ. Amen. AMEN Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen.

Download the sheet music

EKWEM N'OTU CHINEKE (I BELIEVE IN ONE GOD)

EKWEM N'OTU CHINEKE (I BELIEVE IN ONE GOD)

By Okwy Tony Umeh (Rev. F...
Solfa
Igbo
1 page
1 Downloads
Creed (I believe) Mass Settings
0 0

More lyrics you may want