Full Lyrics
CHORUS
Ekwe m n'otu Chineke,
Nna jị ike n'ile,
Onye mere eluigwe n'ala.
VERSE 1
Ekwe m n'otu Chineke, Nna jị ike nile, Onye mere eluigwe n'ala, n'ihe dum a naahụ anya, na ndị anaghị ahụ anya.
Ya na otu Onyenweanyi, Jesu Kristi, sọ otu Nwa Chineke mụrụ: Nna mụrụ tupu ụwa tụwa nile.
VERSE 2
Chukwu si na Chukwu, Ihe si na Ihe, Ezi Chukwu si n'Ezi Chukwu, a mụrụ amụ, emeghị eme.
Ya na Nna bụ otu ihe n'ihe ha ji bụrụ Chukwu, Onye e si na ya mee ihe dum.
VERSE 3
Onye maka ihi anyị bụ mmadụ na maka ihi nzọpụta anyị, siri n'eluigwe gbadata, o were ahụ na Virgin Maria site na Mmụọ Nsọ.
Ọ bụrụ mmadụ, a bịa kpọgbuo ya n'obe n'ihi anyị n'oge ọchịchị Pontus Pilate.
VERSE 4
Ọ taa ahụhụ, Ọ nwụọ, e lie ya. Ma Ọ bilitere n'ụbọchị nke atọ, ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo.
Ọ rọgọrọ n'eluigwe nọrọ n'aka nri Nna. Ma Ọ gaabịaghachi ọzọ n'ebube ya, ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe.
VERSE 5
Onye ọchịchị ya enweghị njedebe. Ekwe m na Mmụọ Nsọ, Onyenweanyi naenye ndụ; Onye siri na Nna na Nwa pụta.
Onye a naesekpuru, naetokọdọ, ya na Nna na Nwa; Onye si na ndị Amụma kwuo okwu.
VERSE 6
Ekwe m n'otu Nzukọ Nsọ Katọlik, na Apọstọlik, e kwupụta m otu baptism nke mgbaghara njọ.
A na m atụ anya mbilite n'ọnwụ ndị nwụrụ anwụ, na ndụ ụwa gaabịanụ. Amen.
AMEN
Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen.