Full Lyrics
CHORUS
Ekwere'm n'otu Chukwu
Ekwere'm n'otu Chukwu
Ekwere'm n'otu Chukwu
Chukwu n'otu Chukwu.
VERSE 1
Nna j'ike nile
Onye mere'eligwe n'ala na ihe dum
A n'ahu anya na'n di'a na ghi'ahu'anya
Nna muru tupu eh uwa t'uwa nile.
VERSE 2
Chukwu si na Chukwu
Ihe si n'ihe ezi Chukwu si n'ezi Chukwu
Amuru y'amu
Amura y'amu emeghi y'eme
Ya na Nna bu otu ihe
N'ihe ha ji buru Chukwu
N'ihe ha ji buru Chukwu.
Siri n'eligwe
Siri n'eligwe gbadata
VERSE 3
Ó wer'ahu
Ó wer'ahu
Ó wer'ahu na Virgin Maria
Site na Muó Nsó
Ó buru mmadu.
A bia kpógbuo ya n'obe
N'obe n'obe n'ihi'anyi
N'ogó chichi Póntus Pilate
Ó nwuó ó nwuó ó nwuó e lie ya.
VERSE 4
Ma n'obili tere n'ubóchi nke ató
Ka akwukwó nso siri kwu eh
Ó lagoro n'eligwe
O n'ódu n'aka nri Nna
Ma ó ga bia gha chi'ózó
N'ebube ya ikpe ndi di ndu na ndi nwur'anwu'ikpe
Onye óchichi y'enweghin jedebe
Eh obiliwo eh obiliwo
Obiliwo obiliwo.
VERSE 5
Ekwere'm na Muó Nsó
Onye nw'anyi n'enye ndu
Onye siri na Nna na Nwa puta
O ny'a n'esekpure n'eto
K'ódo ya na Nna na
Onye si n'ónu ndi'amuma kwu'o kwu.
VERSE 6
Ekwere'm n'otu nzukó'nso
Katólik n'Apóstólik
Ekwuputam'otu baptisma
Nke mgbaghara njó
A nam'a tu'a nya
A nam'a tu'a nya
Nya mbili te n'ónwu ndi nwur'anwu
Na nd'uwa n'a bia nu.
Amen amen amen amen
Amen amen amen amen amen.