EKWEM N'OTU CHINEKE by Okwy Tony Umeh (Rev. Fr.) — Lyrics

Okwy Tony Umeh (Rev. Fr.) Igbo Creed (I believe) Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS E kwem n'otu Chineke Nna ji ike niile Onye mere'ligwe n'ala E kwem n'otu Chineke Nna ji ike niile Onye mere'ligwe n'ala VERSE 1 E kwem n'otu Chineke, Nna ji ike niile, Onye mere eluigwe na ala, n'ihe dum a naahụ anya, na ndị a naghị ahụ anya. Ya na otu Onye nwe anyị, Jesu Kristi sọ otu Nwa Chineke mụrụ. Nna mụrụ tupu ụwatụwa niile. VERSE 2 Chukwu si na Chukwu, Ihe si na Ihe. Ezi Chukwu si na Ezi Chukwu. A mụrụ amụ, emeghị eme. Ya na Nna bụ otu ihe n'ihe ha ji bụrụ Chukwu, Onye e si na Ya mee ihe dum. VERSE 3 Onye maka ihi anyị bụ mmadụ na maka ihi nzọpụta anyị, siri n'eluigwe gbadata ọwere ahụ na Virgin Maria site na Mụọ Nsọ. Ọ bụrụ mmadụ. A bịa kpọgbuo Ya n'obe n'ihi anyị n'oge ọchịchị Pontus Pilate. VERSE 4 Ọ taa ahụhụ, Ọ nwụọ, e lie Ya. Ma Ọ bilitere n'ụbọchị nke atọ, ka akwụkwọ nsọ si kwuo. Ọ rọgoro n'eluigwe nọrọ n'aka nri Nna. Ma Ọ gaabịaghachi ọzọ n'ebube Ya ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe. VERSE 5 Onye ọchịchị Ya enweghị njedebe. E kwem na Mụọ Nsọ, Onye nwe anyị naenye ndụ: Onye si na Nna na Nwa pụta. Onye a naasekpuru, naetokodo, Ya na Nna na Nwa. Onye si n'ọnụ ndị Amụma kwuo okwu. VERSE 6 E kwem n'otu Nzukọ Nsọ Katọlik, na Apọstọlik, E kwupụta m otu Baptism nke mgbaghara njọ. A na m atụ anya mbilite n'ọnwụ ndị nwụrụ anwụ, na ndụ ụwa gaabịanụ. AMEN Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen.

Download the sheet music

EKWEM N'OTU CHINEKE

EKWEM N'OTU CHINEKE

By Okwy Tony Umeh (Rev. F...
Solfa
Igbo
2 pages
4 Downloads
Creed (I believe)
0 0

More lyrics you may want