Full Lyrics
CHORUS
E kwem n'otu Chineke
Nna ji ike niile
Onye mere'ligwe n'ala
E kwem n'otu Chineke
Nna ji ike niile
Onye mere'ligwe n'ala
VERSE 1
E kwem n'otu Chineke, Nna ji ike niile, Onye mere eluigwe na ala, n'ihe dum a naahụ anya, na ndị a naghị ahụ anya.
Ya na otu Onye nwe anyị, Jesu Kristi sọ otu Nwa Chineke mụrụ. Nna mụrụ tupu ụwatụwa niile.
VERSE 2
Chukwu si na Chukwu, Ihe si na Ihe. Ezi Chukwu si na Ezi Chukwu. A mụrụ amụ, emeghị eme.
Ya na Nna bụ otu ihe n'ihe ha ji bụrụ Chukwu, Onye e si na Ya mee ihe dum.
VERSE 3
Onye maka ihi anyị bụ mmadụ na maka ihi nzọpụta anyị, siri n'eluigwe gbadata ọwere ahụ na Virgin Maria site na Mụọ Nsọ.
Ọ bụrụ mmadụ. A bịa kpọgbuo Ya n'obe n'ihi anyị n'oge ọchịchị Pontus Pilate.
VERSE 4
Ọ taa ahụhụ, Ọ nwụọ, e lie Ya. Ma Ọ bilitere n'ụbọchị nke atọ, ka akwụkwọ nsọ si kwuo.
Ọ rọgoro n'eluigwe nọrọ n'aka nri Nna. Ma Ọ gaabịaghachi ọzọ n'ebube Ya ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe.
VERSE 5
Onye ọchịchị Ya enweghị njedebe. E kwem na Mụọ Nsọ, Onye nwe anyị naenye ndụ: Onye si na Nna na Nwa pụta.
Onye a naasekpuru, naetokodo, Ya na Nna na Nwa. Onye si n'ọnụ ndị Amụma kwuo okwu.
VERSE 6
E kwem n'otu Nzukọ Nsọ Katọlik, na Apọstọlik, E kwupụta m otu Baptism nke mgbaghara njọ.
A na m atụ anya mbilite n'ọnwụ ndị nwụrụ anwụ, na ndụ ụwa gaabịanụ.
AMEN
Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen.