Ekwem n'otu Chukwu by Anokwu Paschal C — Lyrics

Anokwu Paschal C Igbo Creed (I believe) Staff & Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Ekwem n'otu Chukwu, Ekwem n'otu Chukwu, Nna j'ike niile Onye mere eluigwe n'ala. Ekwem n'otu Chukwu, Nna j'ike niile Onye mere eluigwe n'ala. Ekwem n'otu Chukwu, Nna j'ike niile Onye mere eluigwe n'ala. VERSE 1 Ya na Jesu Kristi, so otu nwa Chineke muru, Nna muru tupu uwa tuu uwa niile, Chukwu si na Chukwu Ihe si n'ihe Ezi Chukwu si n'ezi Chukwu, a muru amu e meghi eme. VERSE 2 Onye 'si na Ya mee ihe dum. Ya na Nna bu otu ihe n'odidi ebighebi ha jiri buru Chukwu. Onye maka ihi anyi bu mmadu na maka ihi nzoputa anyi siri n'eluigwe gbadata. O were ahu na Vejin Maria, site na Mmuo Nso O buru mmadu. A kpogbuo Ya n'obe n'ihi anyi n'oge ochichi VERSE 3 Pontus Pailet; O taa ahuhu O taa ahuhu O nwuo elie Ya. Bochi nke ato, ka Akwukwo Nso si kwuo O rogoro n'eluigwe n'oro n'aka nri Nna. Ma O ga abiaghachi ozo n'ebube Ya, ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu ikpe, Onye ochichi Ya naenweghi njedebe. Ekwerem na Mmuo Nso, Dinwenu na Onye naenye ndu. Onye si na Nna na Nwa puta. Onye a naesekpuru na etokodo Ya na Nna na Nwa Onye si na ndi amuma kwuo okwu. VERSE 4 Ekwerem na nzuko nke di otu, di nso, buru katolik na apostolik. Ekwuputam otu mmirichukwu maka mgbaghara njo. Ana m atu anya mbilite n'onwu ndi nwuru anwu, na ndu uwa ga abianu. Amen! Amen! Amen! Amen!

Download the sheet music

Ekwem n'otu Chukwu

Ekwem n'otu Chukwu

By Anokwu Paschal C
Staff & Solfa
Igbo
9 pages
2 Downloads
Creed (I believe)
0 0

More lyrics you may want