EKWERE M N'OTU CHINEKE by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Creed (I believe) Solfa notation

Full Lyrics

[REFRAIN I] Ekwere m n'otu Chineke, Nna, onye j'ike nile. [VERSE 1] Onye mer'eligwe n'ala, n'ihe nile a n'ahu anya na ndi a n'aghi ahu anya. [VERSE 2] Ya n'otu Onyenwe anyi, Jesu Kristi, S'otu Nwa Chineke muru. [VERSE 3] Nna muru tup'uwa awa nile Chukwu si na Chukwu, ihe si n'ihe... [VERSE 4] Ezi Chukwu Si n'ezi Chukwu. [VERSE 5] A muru Ya amu, emeghi Ya eme, Ya na Nna bu otu n'ihe ho ji buru Chukwu [VERSE 6] Onye si na Ya mee ihe nile, Onye mak'ihi anyi bu mmadu. [VERSE 7] Na mak'ihi nzoput'anyi, Siri n'eligwe gbadata... [AD LIBITUM A CAPPELLA] O wer'ahu na Virgin Maria Site na Muo Nso, O buru mmadu. A bia kpogbuo Ya n'obe, N'oge ochichi Pontius Pilate O tahuhu, nwuo, Elie Ya. [VERSE 8] Ma O bilitere n'ubochi nke ato ka akwukwo nso siri kwu. [REFRAIN II] O bilitere n'onwu, O bilitere n'onwu. O rogoro n'eligwe no n'aka nri Nna. [VERSE 10] Ma O g'abiaghachi n'otito ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu ikpe. [VERSE 11] Onye ochichi Ya enweghi njedebe. [VERSE 12] Ekwere m na Muo Nso, Onyenwe anyi n'enye ndu, [VERSE 13] Onye si na Nna na Nwa puta, Onye a n'esekpuru. [VERSE 14] N'etokpodo, Ya na Nna na Nwa: Onye si n'onu ndi amuma kwuo okwu. [VERSE 15] Ekwe m n'otu nzuko nso Katolik, n'Apostolik. [VERSE 16] Ekwuputa m otu Baptisma nke mgbaghara njo. [VERSE 17] Anam atuanya, mbilite n'onwu ndi nwuru anwu na ndu uwa g'abianu. Amen. Amen. Amen. Amen.

Download the sheet music

EKWERE M N'OTU CHINEKE

EKWERE M N'OTU CHINEKE

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
2 pages
6 Downloads
Creed (I believe)
0 0

More lyrics you may want