Full Lyrics
REFRAIN
Bịanụ lelee!
Bịanụ lelee o!
Bịanụ lelee nya.
Ebube Chineke nk'igwe.
Bịa kelee Chineke o, ụmụnne m o,
Ebube Chineke n'arụ m o!
VERSE 1
Ekpere m kpere, Ọ nụgo ya.
Ayịyọ m yọrọ, Ọ nụgo ya.
Ikpere m gburu n'ala, Chineke anụgo ya.
Ebube Chineke zuru m ahụ.
VERSE 2
Ndị enyi m o, bịa kelee Chineke.
Ndị ezinụlọ m o, keleere m Chukwu o.
Ikwu n'ibe, soro m kelebe Chineke. Lekene!
Ebube Chineke zuru m ahụ.
VERSE 3
Onyinye mara mma ka m jiri bịa.
Egwu ịgba na egwu mara mma ka m ji wee bịa.
Onyinye dị mma, onyinye si n'obi ka m ji wee bịa.
Ebube Chineke zuru m ahụ.