Full Lyrics
REFRAIN
Heh! Obiligo! Eh! Obiligo!
Kristi emerigo ọnwụ.
Ọnwụ na njọ eeh, ọ merigo.
Olorihe lo r'enyi!
K'anyị ṅụrịbanụ, kutenụ egwu ọma,
Alleluia, Alleluia,
Ụwa niile ṅụrịba,
K'anyị rịọpị ike;
Kristi Dinwen'anyị n'ezie Ọ merigo.
Ọdọgwu n'agha!
Aka n'ebu gbabaranụ j'egwu.
Ọdọgwu! Ọdọgwu n'agha.
Ik'ekwensu adagụ mba,
nmeri Chukwu agam'aja ya mma,
Kele ya, Onye nmeri,
Ọ kaa Ọ mee!
Dike n'agha!
Ọgba ak'e j'ọgụ!
Chinek'egosigo na Ya b'Eze
guzorogo!
Nwa Chineke Ọ merigo.
Ike k'ike!
Ọdọgwu, eeh Ọdọgwu emerigo.
VERSE 1
Na Gesthamani Kristi ruru uju.
Ọ kpuogwu, ụtari apịara ya,
Anya mmiri, Ọ kwara ya.
akpọgbue ya n'obe Ọ merigo.
VERSE 2
N'ụtụtụ, mgbe anwụ walụ n'ụbọchị nk'atọ;
Ụmụ nwaanyị gara n'ili mana ha hụghị ya.
Chọọ Jesu n'ebeliri ya,
Chọsịa ya, mana ha hụghị ya.
Ha chọrọ y'elu, Chọọ ya n'ala,
Chọọ ya n'ugwu, ha wee bee akwariri.
Chọọ y'ebe niile mana ha hụghị ya.
VERSE 3
Otu Mmụọzi kwụrụ n'ụzọ wee sị ha
Ṅụlịbanụ! Kristi Dinwenụnụ ebiligo!
Ọ bụrụ gụnụ ụzọ gaba na Galilee
n'obiligo!
VERSE 4
Aka nri Chukwu emeriela.
Aka nri Y'eweliela m'elu.
Aka Chineke dị ebube n'aru m o.
Wer'aka Gị, Nna, gọziwe m o!
Wer'aka Gị, Nna, buliwe m'elu!
Ọnwụ Olee ike gị? Ọ merigo!
Ọnwụ, kedi ike gị o?
Kristi, bụ Onye nwe nmeri Ọ merigo!
Onyegbu r'egbu, lie ya n'ala,
wer'okwate kpuchite ya;
Obiligo! Alleluia, Ọ merigo!
Ik'eji ej'ọgụ bụ Onye nwe nmeri! Ọ merigo!