Full Lyrics
REFRAIN
Dinwenu Jesu Christi,
Nke nọ na Eucharistia,
Biko bịa, O bịa biri n'ime m,
Gị biri n'ime m, ndụ m ọ dị nsọ ozigbo,
Dinwenu Jesu bịa.
VERSE 1
Jesu Dinwenu, ndụ zuru oke nọ n'ime Gị.
Obim agaghị ezu ike belụsọ mu na Gị nọ oge nile.
VERSE 2
Obim ekwere wo k'ị bata n'ime m doo m ọcha.
Obim agaghị ezu ike belụsọ mu na Gị nọ oge nile.
VERSE 3
Gee ntị Dinwenu, gee ntị O Jesu, gee mu ntị.
Obim agaghị ezu ike belụsọ mu na Gị nọ oge nile.
VERSE 4
Sọsọ Dinwenu, sọsọ Gị Jesu kam geso.
Obim agaghị ezu ike belụsọ mu na Gị nọ oge nile.
VERSE 5
Mmụọ nke Dinwenu, Mmụọ nsọ Chineke nyere ụmụ ya.
Bịa duga m na altar nke Chukwu ka mu na Dinwenu nọrọ oge nile.