DETU ONYENWANYI ONU by Ihebinike George — Lyrics

Ihebinike George Igbo Communion Hymns Responsorial Psalms Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Detuo Onyenw'anyi onu ka i hu na Dinwenu di uto. VERSE 1 A gam agozi Onyenw'anyi mgbe nile otito Ya gadi n'onum ka m kpuru obim tobe Onyenw'anyi ndi umeala g'anu olum wee nuria. Detu Ya onu n'o di uto. VERSE 2 Anya Onyenw'anyi wukwasara na ndi eziomume O chere nti n'akw'ahu akwa ha n'ebe buso ndi aruruala agha agha buso h'agha iji mee k'a gharai cheta ha ozo n'elu uwa. Detu Ya onu n'o di uto. VERSE 3 Mgbe obula onye eziomume tikuru Onyenweanyi O naanuolu ha, O naanuolu ha O na egboro ha mmekpa ahu ha nile Onyenw'anyi no ndi obi gbawara agbawa nso O naazoputa ndi agbapiara obi. Detu Ya onu n'o di uto. VERSE 4 Nsogbu chere onye eziomume n'ihu akari ka ma Onyenw'anyi n'agbaputacha ya n'aha nile O na eche okpukpu ya nile nche ka agha ri nwe otu n'ime ha gagbajiri nu. Detu Ya onu n'o di uto. VERSE 5 Ajo omume gburu onye ome k'ome ma ndi iro onye eziomume ga akwugwo mmehie ha Onyenweanyi g'agbaputa ndu umu odibo Ya onye obula gbatara osondu n'ime Ya anoghi na mmehie. Detu Ya onu n'o di uto.

Download the sheet music

DETU ONYENWANYI ONU

DETU ONYENWANYI ONU

By Ihebinike George
Solfa
Igbo
2 pages
2 Downloads
Communion Hymns Responsorial Psalms Hymns
0 0

More lyrics you may want