Full Lyrics
REFRAIN
Daalụ O Chineke imela
Ihe i meere m o ka m jiri bịa n'ihu gị
Ọrụ i rụrụ m o ka m jiri bịa n'ihu gị
N'ịkọba kọba kọba n'm e so e ma gị n'elu ụwa
Chi gaeji chi gaabọ ma n'kọba ihe i mere n'isi m o
Chi gaeji chi gaabọ ma n'kọba ọrụ i rụrụ na ndụ m o
Ndị ikwu n'ibe m o, biana nụ
Soro m k'anyị jee, kụba nkwụ gbaa egwu gaa n'ihu ya kele ya
Sị ya n'o mela
VERSE 1
Igwe rọ n'ọrịa a bịara m be gị
I bia sị gị daalụ
Ekele ka m ji bịa
VERSE 2
Chi naenye nwa, i nyegom nwa
A ga m ekele gị
I nyere m nwa nwoke, nye m nwa nwanyị, ha ncha b'onyinye gị
Ya ka m ji bịa n'ihu gị, ịtụrụ gị mmamma
VERSE 3
A rịọrọ m di, i nyere m o
I nyere m o
Ọ bụ gịnị ka m gaeji kele gị, Chukwu ọma imela