Full Lyrics
CHORUS
Nara anyịa rịọ Gị, nara 'ja 'nyị,
Ezi Chukwu, Ezi Chukwu, nabata ya.
Were ya, gọzie ya, mekwua ya Nna kọdị mma,
kwesị nị ga nara ya.
VERSE 1
Mgbe anyị n'eru nyere Gị aja obiọma 'nyị,
nke bụ ihe ala mịpụtara.
Ọbụghị nkwughachi, Ịhụnanya Gị,
anyị'enweghị 'ke ya.
VERSE 2
Mgb'ọbụla 'nyị bụ 'mụ Gị gbakọrọ n'iru Gị,
Ịchụrụ Gị aja kasị nsọ.
K'anyị n'erunye ya, maka ndị mmadụ nile,
ndị dị ndụ na ndị nwụr'anwụ.
VERSE 3
Sọ Gị bụ'ndụ ndị kwere na Gị,
ndụ ihe nile, n'ụwa, na n'eligwe.
Gosi'anyị'ụzọ nke ka mma iji wee gosi Gị,
añụrị anyị na Gị.
VERSE 4
Ndị nsọ n'ekwukwe'añụrị eto afọma Gị,
n'eto kw'ike Gị.
Kwere k'ayị soro ha too Gị,
oge nile site na 'ja 'nyị.
VERSE 5
Gọzie'anyị, gọzie'anyị, gọzie, O Chukwu'anyị,
ndị n'achụrụ Gị aja;
nara 'nyị, nara 'nyị, nara O Chukwu'anyị
aja nke onwe'anyị.