ỌBARANAHỤ by Alex Ugwu (OZIGE) — Lyrics

Alex Ugwu (OZIGE) Igbo Communion Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[SECTION A] SOLO: Ofu ayịrịọ dịkwụm n'arịọ b'ọbara n'ahụ Chukwuọma, sachaa m o. Ofu ayịrịọ dịkwụm n'arịọ b'ọbara n'ahụ Chukwuọma, sachaa m o. SOPRANO: Mkpụrụobi mụ n'ebakwa ka achịcha na mmanya e doro nsọ nọlita, O wee gbanwee, wee bụrụ ọbara n'ahụ Chukwuọma, sachaa m o. [SECTION B] Ngwa, ngwa, ngwa nụ e Ndịọma kulite, Ngwa nụ k'anyi jee nara ma rie nri si n'igwe; ahụ n'ọbara nwa atụrụ. Ngwa, ngwa, ngwa nụ e Ndịọma kulite, Ngwa nụ k'anyi jee nara ma rie nri si n'igwe; ahụ n'ọbara nwa atụrụ. Ụmụnne nụ bịanụ k'anyi jee nara ya, Kulite k'anyi jee nara ya ma rie, N'ọkwanụ achịcha na mmanya, mana ha ncha bụzi ọbara n'ahụ ya. Ndịọma kulite, ngwa nụ k'anyi jee nara ma rie nri si n'igwe; ahụ n'ọbara nwa atụrụ. [SECTION C] Ọbara sachaa m o, achịcha nyenụ mụ ndụ, K'ọbara n'ahụ Chukwu bata n'obi m o. Ọbara sachaa m o, achịcha nyenụ mụ ndụ, K'ọbara n'ahụ Chukwu bata n'obi m o! Ọbara sachaa m o, achịcha nyenụ mụ ndụ, Arịọ m ayịrịọ k'ọbara n'ahụ Chukwuọma sachaa m o. Ọbara sachaa m o, achịcha nyenụ mụ ndụ, Arịọ m ayịrịọ k'ọbara n'ahụ Chukwuọma sachaa m o. [SECTION A2] Ofu ayịrịọ dịkwụm n'arịọ b'ọbara n'ahụ Chukwuọma, sachaa m o. A nam arịọ nụ ka ọbara n'ahụ Chukwuọma sachaa m o. Mkpụrụobi mụ n'ebakwa ka achịcha na mmanya e doro nsọ nọlita, O wee gbanwee, wee bụrụ ọbara n'ahụ Chukwuọma, sachaa m o.

Download the sheet music

ỌBARANAHỤ

ỌBARANAHỤ

By Alex Ugwu (OZIGE)
Solfa
Igbo
2 pages
58 Downloads
Communion Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want