Full Lyrics
VERSE 1
Kunienu k'anyi jenu rie,
Kunienu k'anyi jenu rie,
Kunienu k'anyi jenu rie,
biko kunite k'anyi jenu rie,
nwanne m k'anyi jenu rie,
k'anyi jee rie nu, nua nu,
ahu n'obara Nwa aturu.
Aku nwere n'ime ya ihe usọ nile,
O riri n'onunu n'enye ndu ebigh'ebi,
Nri anyi naanata bu ahu n'obara Kristi.
Cheta n'obu Sacrament nke Eucharistia.
VERSE 2
Lokene nu k'osi bul'uche Chukwu
iwer'onwe ya meera nyi nri,
nri nke ndu ebebe.
Lokene nu k'osi bul'uche Chukwu,
iwer'onwe ya meera nyi nri,
nri mkpur'obi, meera nyi nri nke ndu ebebe.
VERSE 3
K'anyi sekpuere Dinwenu Kristi,
K'anyi sekpuere Dinwenu na sacrament nke kachasi nsọ.
K'anyi sekpuere Dinwenu,
K'anyi tie isi ala gbue ikpere nye Dinwenu Kristi
k'anyi gbue ikpere nye Dinwenu,
Onye gosigoro anyi ebere Ya.
VERSE 4
Ndi otu Kristi, bukota nu ihe egwu di mma.
Bukota nu ihe egwu di okegwu
chiri n'u n'ubọ akwa too Ya,
wetanu opi di mma were nu bọ di mma
na egwu otiti di mma too Ya,
Buoro Eze bube Chukwu anyi abu ọma.
OTITO
Otito na ngozi diri Chukwu Nna na Nwa na Chukwu Muọ Nsọ.
Nsopuru diri Chineke Ato n'ime Otu di ngozi,
ugwu ni di nsọ diri Ya ebebe. Amen.
Ugwu ni di nsọ diri Ya ebebe. Amen.