Full Lyrics
INTRO
Bịa nụ ụmụ Chukwu, ụmụ Chukwu,
k'anyị je nụ nara Christi n'oriri dị nsọ.
Nri n'enye obi ọma, nri n'enye ndụ ebebe, eye,
k'anyị jee nie nụ, k'anyị jee nie nụ,
nri si n'igwe, nri Christi nyeranyị.
CHORUS
K'anyị kulie nụ, jee nara, k'anyị jee nie nụ nri ọma.
K'anyị kulie nụ, jee nara Christi, bịa rie,
nri n'enye ndụ, nri ndị ọma, nri Christi nyeranyị.
VERSE 1
Jesu sịrị ahụ m bụ ihe oriri,
m bụ ihe ọṅụṅụ, ihe ọṅụṅụ, ihe ọṅụṅụ, ihe ọṅụṅụ,
nke n'enye ndụ.
Beere sọ m riri ahụ m ma ṅụọ ọbara m o,
ị gaghị enwe ndụ n'ime gị.
VERSE 2
Jesu bịa o, ka ị biri,
Jesu bịa, ka ị biri,
Jesu bịa o, ka ị biri n'ime m.
Ka ị doo mụ nsọ, Jesu bata o n'ime m.
Jesu, kidoo mụ nsọ n'obi m.
Jesu bata o, mee mụ ka m dị ọcha.