Full Lyrics
REFRAIN
Jesus enyi m ọma, ezigbo enyi m o, Jesus
Ezi enyi ka nwanne, enyi m ọma, ezi enyi m obi m o
Ọ dị n'obi m o, ọ n'asọ mkpụrụ obi m ịnọ Gị nso.
VERSE 1
Sọ Gị n'eme daa m obi, Jesus enyi m ọma
Bịa medaa m obi, ezi enyi m o
Obi m n'ajụrụ m a m nọrube Gị nso
Ọ dị n'obi m o, Jesus enyi m ọma.
VERSE 2
Sọ Gị n'enye m udo, udo nk'obi m o
Jesus bịa nye m udo n'ime obi m o
Udo nke mkpụrụ obi bụ sọ Gị n'enye ya
Ọ dị n'obi m o, Jesus enyi m ọma.
VERSE 3
Jesus enyi m ọma, enyi m ọma, enyi m ọma.
CANTORS
Jesus enyi m ọma
Enyi ka nwanne
Ọ dị n'obi m o
Ihe Gị n'amasị m o
M nọrube Gị Jesus, obi ajụrụ m o
Bịa nụ ka mụ na Gị nọrọ, ezi enyi m o
Bịa nụ k'ị medaa m obi, Ọ dị n'obi m o.