Full Lyrics
REFRAIN
Jesu bata n'obi ndi kwere kwe
Bata bata nye ha ndu
N'im'obi ha
Ahu Gi bu ih'oriri e
Obara Gi bu ih'onunu
Biko bata nye ha ndu n'uju
VERSE 1
O nwere ndia gu u n'agu
Ndia kpiri Gi n'akpo nku
O Dinwenu bata buru nri nke obi ha
VERSE 2
O nwere ndi n'on'uru
Ndi nani Gi bu Ike ha
O Dinwenu bata buru ntasi obi ha
VERSE 3
O nwere ndi no na nsogbu
Ndi nani Gi bu enyemaka ha
O Dinwenu bata buru Ony'enyemaka ha
VERSE 4
Chukwu Nna biko bata
Chukwu Nwa na Chukwu Muo Nso
Ato n'otu Chukwu biko bata nye ha ndu n'uju
Onye k'er'uwa biko bata nye ha ndu n'uju
Onye nzoputa biko bata nye ha ndu n'uju
Onye n'enyihe biko bata nye ha ndu n'uju
Onye n'enye ndu biko bata nye ha ndu n'uju
Amen