Full Lyrics
REFRAIN
Nwa Chineke, bia nara Nri si n'igwe.
Enwen'obi abuo. Bia kene, Kristi n'akpo gi.
Bia k'I nara Achicha si n'igwe.
Wer' obi ocha na um'ala bia n'iru Chineke.
Bia nara, bia nara o! Bia nuru mmiri ndu.
Nara Ahu Kristi rie, akwun'ugwo.
VERSE 1
Mak'ihi anyi ka Chukwu Nwa jiri bia n'el'uwa.
O biara n'uwa were kuziere mmadu uzo eligwe.
O tara ahuhu maka njo anyi, akpogbue Ya n'obe.
VERSE 2
Ahu Kristi bu ihe oriri maka ndi n'on'ije.
Obara Ya bu ihe onunu maka nd'ike n'agwu.
Buru mkpa gi nile, ezinwanne m, busa n'ukwu Kristi.
VERSE 3
Ahu Kristi n'agw'oria nile.
Obara Kristi n'eficha njo nile.
O g'ebelata oriwarawara nke aguu ime njo.
O g'enyekwa gi mbe nke ndu ebigh'ebi.