Full Lyrics
Mkpụrụobi Onye nzọpụta doo m'asọ,
doo m'asọ, doo m'asọ.
Ahụ Kristi zọpụta m o,
ọbara Kristi gbube m o doo!
Mmiri si n'akụkụ Kristi sachaa nụ m o,
ahụhụ Kristi nye m'ike.
Jesu dị mma nụrụ n'olu m uo!
Zobe mu n'ime ọnya Gị,
ekwela ka m kewa pụ onwem n'ebe I nọ.
Chebe m, chebe m, chebe m,
n'ebe onye iro n'eche echiche ọjọọ nọ.
Kpọọ m n'oge ọnwụ m ka m bịa kwute Gị,
soro ndị mmụọ ọma n'eto Gị ebighebi.
Amen!